2 Ihe E Mere 33:23
2 Chronicles 33:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma o wedaghị onwe ya ala nʼihu Onyenwe anyị dịka Manase nna ya mere. Kama Amọn gara nʼihu mee ka ikpe ọmụma ya mụbaa.
2 Chronicles 33:23 in English
2 Chronicles 33:23 · Berean Standard Bible
but he did not humble himself before the LORD as his father Manasseh had done; instead, Amon increased his guilt.
Context
21Amọn gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ abụọ na Jerusalem. 22O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Manase mere. Amọn kpọrọ isiala, chụọkwa aja nye arụsị niile, nke Manase mere. 23Ma o wedaghị onwe ya ala nʼihu Onyenwe anyị dịka Manase nna ya mere. Kama Amọn gara nʼihu mee ka ikpe ọmụma ya mụbaa. 24Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu ya nʼime ụlọeze ya. 25Mgbe ahụ, ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbara izu megide eze Amọn. Ha mere Josaya nwa ya nwoke eze nʼọnọdụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.