Native Bible

2 Chronicles 33:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, Onyenwe anyị mere ka ndị ọchịagha nke eze ndị Asịrịa bịa buso ha agha, bụ ndị jidere Manase, gbanye ya nko igwe nʼimi, were ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya laa Babilọn.

2 Chronicles 33:11 in English

2 Chronicles 33:11 · Berean Standard Bible

So the LORD brought against them the military commanders of the king of Assyria, who captured Manasseh, put a hook in his nose, bound him with bronze shackles, and took him to Babylon.

Context

9Ma Manase duhiere Juda na ndị Jerusalem, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị Onyenwe anyị lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel. 10Onyenwe anyị gwara Manase na ndị ya okwu, ma ha egeghị ntị. 11Nʼihi ya, Onyenwe anyị mere ka ndị ọchịagha nke eze ndị Asịrịa bịa buso ha agha, bụ ndị jidere Manase, gbanye ya nko igwe nʼimi, were ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya laa Babilọn. 12Nʼoge ahụ ka anya doro Manase. O wedara onwe ya ala nke ukwuu, rịọọ amara site nʼaka Onyenwe anyị Chineke nna nna ya. 13Onyenwe anyị nụrụ arịrịọ ya mee ya ka ọ lọtakwa nʼalaeze ya na Jerusalem. Mgbe ahụ, Manase matara na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.