Native Bible

2 Chronicles 32:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hezekaya bụkwa onye gbochiri mmiri iyi Gaihọn nʼakụkụ elu elu ya, gwuo olulu ebe mmiri ahụ si sọgharịa na-asọbata nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo Devid. Ihe niile o mere gaara ya nke ọma.

2 Chronicles 32:30 in English

2 Chronicles 32:30 · Berean Standard Bible

It was Hezekiah who blocked the upper outlet of the Spring of Gihon and channeled it down to the west side of the City of David. And Hezekiah prospered in all that he did.

Context

28O wukwara ọtụtụ ụlọ ọzọ ebe a na-echebe ọka, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv. O wukwara ụlọ anụmanụ maka ọtụtụ igwe ewu na atụrụ ya. 29O wukwara ọtụtụ obodo nta dị iche iche, nweekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, nʼihi na Chineke mere ka ọ baa ụba. 30Hezekaya bụkwa onye gbochiri mmiri iyi Gaihọn nʼakụkụ elu elu ya, gwuo olulu ebe mmiri ahụ si sọgharịa na-asọbata nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo Devid. Ihe niile o mere gaara ya nke ọma. 31Ma mgbe ndị ozi nke ndị na-achị Babilọn zitere ka ha jụọ ya banyere ihe ebube ahụ nke mere nʼala ahụ, Chineke hapụrụ ya i nwalee ya, ka ọ mara ihe niile dị ya nʼobi. 32Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Hezekaya, na ọrụ ebere niile nke ọ rụrụ ka edere nʼakwụkwọ ọhụ onye amụma bụ Aịzaya, nwa Emọz, dịkwa nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda na Izrel niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.