Native Bible

2 Chronicles 32:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, Hezekaya ghọrọ eze bara ọgaranya, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ. O wuru ụlọakụ maka ichebe ọlaọcha ya na ọlaedo, na nkume dị oke ọnụahịa, na ụda na-esi isi ụtọ, na ọta na efere ọlaedo ya.

2 Chronicles 32:27 in English

2 Chronicles 32:27 · Berean Standard Bible

Hezekiah had very great riches and honor, and he made treasuries for his silver, gold, precious stones, spices, shields, and all kinds of valuable articles.

Context

25Ma Hezekaya ejighị obi ya niile kelee Chineke ekele nʼihi na nganga batara ya nʼobi. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị megide ya na ndị Jerusalem na Juda. 26Mgbe Hezekaya na ndị Jerusalem wedara onwe ha nʼala, iwe Onyenwe anyị dajụrụ nʼebe ha nọ, ọ takwaghị ha ahụhụ nʼoge niile ahụ Hezekaya dị ndụ. 27Ya mere, Hezekaya ghọrọ eze bara ọgaranya, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ. O wuru ụlọakụ maka ichebe ọlaọcha ya na ọlaedo, na nkume dị oke ọnụahịa, na ụda na-esi isi ụtọ, na ọta na efere ọlaedo ya. 28O wukwara ọtụtụ ụlọ ọzọ ebe a na-echebe ọka, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv. O wukwara ụlọ anụmanụ maka ọtụtụ igwe ewu na atụrụ ya. 29O wukwara ọtụtụ obodo nta dị iche iche, nweekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, nʼihi na Chineke mere ka ọ baa ụba.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.