2 Ihe E Mere 30:8
2 Chronicles 30:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu abụla ndị isiike dịka ha, kama werenụ onwe unu nye Onyenwe anyị. Bịakwanụ nʼụlọnsọ ya nke o doro nsọ ruo ebighị ebi. Fee Onyenwe anyị Chineke unu ofufe, ime ka iwe ya jụrụ nʼebe unu nọ.
2 Chronicles 30:8 in English
2 Chronicles 30:8 · Berean Standard Bible
Now do not stiffen your necks as your fathers did. Submit to the LORD and come to His sanctuary, which He has consecrated forever. Serve the LORD your God, so that His fierce anger will turn away from you.
Context
6Ndị ọgba ọsọ weere akwụkwọ ozi sitere nʼaka eze na ndị ozi ya jegharịa nʼIzrel na Juda niile dịka ihe eze nyere nʼiwu si:
“Unu ndị Izrel, lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ka ọ laghachikwute unu bụ ndị eze Asịrịa na-emeribeghị. 7Unu adịkwala ka nna unu ha, na ụmụnne unu ndị Izrel, ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ha, nke a mere o jiri were ha mee ihe iju anya, dịka unu hụrụ ya. 8Unu abụla ndị isiike dịka ha, kama werenụ onwe unu nye Onyenwe anyị. Bịakwanụ nʼụlọnsọ ya nke o doro nsọ ruo ebighị ebi. Fee Onyenwe anyị Chineke unu ofufe, ime ka iwe ya jụrụ nʼebe unu nọ. 9Ọ bụrụ na unu alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka e gosi ụmụnna unu na ụmụ unu a dọtara nʼagha obi ebere, meekwa ka ha site nʼebe e bugara ha lọghachikwa. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ onye obi ebere, na onye obiọma; ọ gakwaghị agbakụta unu azụ, ma ọ bụrụ na unu echegharịa, lọghachikwute ya.” 10Ya mere, ndị ọgbọ ọsọ ozi ahụ sitere otu obodo gaa obodo ọzọ nʼIfrem, na Manase, ọ bụladị ruo Zebụlọn. Ma ndị mmadụ chịrị ha ọchị, kwaakwa ha emo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.