2 Ihe E Mere 30:25
2 Chronicles 30:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge ahụ kwa, oke ọṅụ jupụtara nʼobi ndị Juda niile, na nʼobi ndị nchụaja na ndị Livayị, na nʼobi ndị ọbịa, na ndị sitere ala Izrel bịa.
2 Chronicles 30:25 in English
2 Chronicles 30:25 · Berean Standard Bible
Then the whole assembly of Judah rejoiced along with the priests and Levites and the whole assembly that had come from Israel, including the foreigners who had come from Israel and those who lived in Judah.
Context
23Nʼihi oke ọṅụ ha niile nwere, ha kpebiri ime mmemme ahụ gaa nʼihu ụbọchị asaa ọzọ. 24Hezekaya eze Juda, nyere nzukọ ahụ otu puku oke ehi, na puku atụrụ asaa. Ndị ozi eze niile nyekwara ha, otu puku oke ehi na puku atụrụ iri. Ọtụtụ ndị nchụaja dooro onwe ha nsọ. 25Nʼoge ahụ kwa, oke ọṅụ jupụtara nʼobi ndị Juda niile, na nʼobi ndị nchụaja na ndị Livayị, na nʼobi ndị ọbịa, na ndị sitere ala Izrel bịa. 26Oke ọṅụ jupụtara na Jerusalem nʼihi na site nʼoge Solomọn nwa Devid, eze Izrel ruo nʼoge a, e mebeghị mmemme dị otu a na Jerusalem. 27Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị Livayị guzoro gọzie ọha mmadụ ahụ niile. Chineke nụkwara ekpere ha site nʼebe obibi ya dị nsọ nke eluigwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.