Native Bible

2 Chronicles 30:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

bụ ndị ji obi ha na-achọ Onyenwe anyị Chineke nke nna nna ha, ọ bụladị ma ọ bụrụ na ha adịghị ọcha dịka iwu nke ebe nsọ si dị.”

2 Chronicles 30:19 in English

2 Chronicles 30:19 · Berean Standard Bible

who sets his heart on seeking God—the LORD, the God of his fathers—even if he is not cleansed according to the purification rules of the sanctuary.”

Context

17Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị so nʼigwe mmadụ ahụ edobeghị onwe ha nsọ, ndị Livayị gbuuru ha atụrụ Mmemme Ngabiga nʼihi na ha adịghị ọcha, ha apụghịkwa ido atụrụ ha nsọ nye Onyenwe anyị. 18Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị sitere nʼIfrem, na Manase, na Isaka, na Zebụlọn edoghị onwe ha ọcha, ma ha sokwa rie oriri ngabiga ahụ, si otu a mebie ihe e dere nʼiwu. Ma Hezekaya kpeere ha ekpere sị, “Ka Onyenwe anyị onye dị mma gbaghara onye ọbụla 19bụ ndị ji obi ha na-achọ Onyenwe anyị Chineke nke nna nna ha, ọ bụladị ma ọ bụrụ na ha adịghị ọcha dịka iwu nke ebe nsọ si dị.” 20Onyenwe anyị nụrụ ekpere Hezekaya gwọọkwa ha. 21Ya mere, ndị Izrel ahụ niile ji ọṅụ mee mmemme achịcha ekoghị eko ahụ na Jerusalem ụbọchị asaa. Ma ndị nchụaja na ndị Livayị ji abụ na ngwa egwu Onyenwe anyị too ya otuto ụbọchị ahụ niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.