Native Bible

2 Chronicles 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O ji osisi junipa machie ahụ ime ụlọ ezumezu ahụ, jirikwa ọlaedo a nụchara anụcha techie osisi ndị ahụ niile. Emesịa, e sere oyiyi nkwụ dị iche iche, na oyiyi ụdọ igwe nʼahụ ụlọ ahụ iji chọọ ya mma.

2 Chronicles 3:5 in English

2 Chronicles 3:5 · Berean Standard Bible

He paneled the main room with cypress,* which he overlaid with fine gold and decorated with palm trees and chains.

Context

3Ntọala Solomọn tọrọ maka iwu ụlọnsọ Chineke dị iri mita abụọ na asaa nʼogologo, mita itoolu nʼobosara. (Nke a bụ ma ejiri ihe ọtụtụ ochie). 4Ịdị ogologo mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ ukwu ahụ dị mita itoolu, dịka ịdị ogologo obosara ụlọ nso ahụ nʼonwe ya. Ịdị elu ya dịkwa mita itoolu. O jikwa ọlaedo a nụchara anụcha machie ime ya. 5O ji osisi junipa machie ahụ ime ụlọ ezumezu ahụ, jirikwa ọlaedo a nụchara anụcha techie osisi ndị ahụ niile. Emesịa, e sere oyiyi nkwụ dị iche iche, na oyiyi ụdọ igwe nʼahụ ụlọ ahụ iji chọọ ya mma. 6O ji nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche chọọ ime ụlọnsọ ahụ mma, ya na ọlaedo nke e si na Pavaim bute. 7Ogidi osisi silin niile, na ibo ọnụ ụzọ niile, na aja ụlọ niile, na ọnụ ụzọ niile dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ ka o ji ọlaedo techie. Ọ gbukwara egbugbu oyiyi cherubim na mgbidi ya niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.