Native Bible

2 Chronicles 28:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Oded, onye amụma Onyenwe anyị, nọ na Sameria nʼoge a. Ọ pụrụ jekwuru ndị agha ahụ na Sameria sị ha, “Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha mere ka unu merie ndị Juda nʼihi na ha na-efe arụsị. Ma unu ji ọnụma gbuo ha, nke mere na ụzụ tụrụ ruo nʼeluigwe.

2 Chronicles 28:9 in English

2 Chronicles 28:9 · Berean Standard Bible

But a prophet of the LORD named Oded was there, and he went out to meet the army that returned to Samaria. “Look,” he said to them, “because of His wrath against Judah, the LORD, the God of your fathers, has delivered them into your hand. But you have slaughtered them in a rage that reaches up to heaven.

Context

7Zikri onye Ifrem, onye bụ dike nʼagha, gburu Maaseia, nwa eze, na Azrikam onye na-elekọta ụlọeze. O gbukwara Elkena onye na-esota eze. 8Ndị Izrel sitere nʼetiti ụmụnne ha ndị Juda dọta ndị inyom, na ụmụ okorobịa, na ụmụ agbọghọbịa ọnụọgụgụ ha dị narị puku abụọ nʼagha. Ha bukọkwaara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha kwatara nʼagha laghachi na Sameria. 9Ma Oded, onye amụma Onyenwe anyị, nọ na Sameria nʼoge a. Ọ pụrụ jekwuru ndị agha ahụ na Sameria sị ha, “Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha mere ka unu merie ndị Juda nʼihi na ha na-efe arụsị. Ma unu ji ọnụma gbuo ha, nke mere na ụzụ tụrụ ruo nʼeluigwe. 10Ugbu a, unu na-achọkwa ime ndị ikom na ndị inyom Juda na Jerusalem ndị ohu unu? Ma unu abụghị ndị ikpe mmehie mara nʼebe Onyenwe anyị Chineke unu nọ? 11Ugbu a, geenụ ntị nʼihe m na-ekwu. Kpọghachinụ ụmụnna unu ndị a unu dọtara nʼagha nʼụlọ ha, nʼihi na ugbu a Onyenwe anyị na-ewe oke iwe megide unu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.