2 Ihe E Mere 28:3
2 Chronicles 28:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ dị iche iche nʼime Ndagwurugwu nke Ben Hinom, surekwaa ụmụ ya nʼọkụ. Ọ gbasoro omenaala niile rụrụ arụ nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼihu ndị Izrel.
2 Chronicles 28:3 in English
2 Chronicles 28:3 · Berean Standard Bible
Moreover, Ahaz burned incense in the Valley of Hinnom and sacrificed his sons in the fire,* according to the abominations of the nations that the LORD had driven out before the Israelites.
Context
1Ehaz gbara iri afọ abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara afọ iri na isii nʼime Jerusalem, ma o meghị ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna ya Devid mere. 2Ọ gbasoro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, kpụọkwa arụsị dị iche iche maka ofufe arụsị Baal. 3O surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ dị iche iche nʼime Ndagwurugwu nke Ben Hinom, surekwaa ụmụ ya nʼọkụ. Ọ gbasoro omenaala niile rụrụ arụ nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼihu ndị Izrel. 4Ọ chụrụ aja surekwaa ihe nsure ọkụ aja na-esi isi ụtọ nʼebe niile dị elu, nʼelu ugwu niile, na nʼokpuru osisi ndụ ọbụla. 5Nʼihi ya, Onyenwe anyị Chineke ya nyefere ya nʼaka eze ndị Aram. Ndị Aram lụgburu ya, kpọrọ ọtụtụ nʼetiti ndị ya dịka ndị mkpọrọ kpọta ha nʼDamaskọs.
E nyefekwara ya nʼaka eze Izrel, onye gburu ọtụtụ ndị agha ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.