Native Bible

2 Chronicles 27:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jotam busoro eze ndị Amọn agha, meriekwa ha. Nʼafọ ahụ, ndị Amọn bunyere ya narị talenti ọlaọcha, na bushel ọka iri puku na puku abụọ, na bushel ọka balị iri puku na puku abụọ.

2 Chronicles 27:5 in English

2 Chronicles 27:5 · Berean Standard Bible

Jotham waged war against the king of the Ammonites and defeated them, and that year they gave him a hundred talents of silver,* ten thousand cors of wheat,* and ten thousand cors of barley.* They paid him the same in the second and third years.

Context

3Jotam wugharịrị Ọnụ Ụzọ Ama nke dị Elu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ nʼelu mgbidi nke ugwu Ofel. 4O wuru ọtụtụ obodo nʼala ugwu ugwu Juda, wuokwa ọtụtụ ebe e wusiri ike na ụlọ elu nche nʼoke ọhịa. 5Jotam busoro eze ndị Amọn agha, meriekwa ha. Nʼafọ ahụ, ndị Amọn bunyere ya narị talenti ọlaọcha, na bushel ọka iri puku na puku abụọ, na bushel ọka balị iri puku na puku abụọ. 6Jotam ghọrọ eze dị ike nʼihi na ọ kpachara anya debe iwu Onyenwe anyị Chineke ya. 7Ihe ndị ọzọ niile nʼoge ọchịchị Jotam, tinyere ihe gbasara agha niile ọ lụrụ, na ihe ndị ọzọ niile nke o mere, e deturu ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel na Juda.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.