Native Bible

2 Chronicles 26:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ụzaya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, onye amụma Aịzaya nwa Emọz deturu ha nʼakwụkwọ.

2 Chronicles 26:22 in English

2 Chronicles 26:22 · Berean Standard Bible

As for the rest of the acts of Uzziah, from beginning to end, they are recorded by the prophet Isaiah son of Amoz.

Context

20Mgbe Azaraya onyeisi nchụaja, na ndị nchụaja ọzọ niile lere ya anya, ha hụrụ na ekpenta agbaala ya nʼegedege ihu ya, ha mere ka ọ site nʼebe ahụ pụọ ngwangwa. Ya onwe ya kwa chọkwara isite nʼebe ahụ pụọ ngwangwa, nʼihi na Onyenwe anyị tiri ya ihe otiti. 21Eze Ụzaya bụ onye ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche, ebe ọ bụ onye ekpenta, na onye amapụrụ site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Jotam nwa ya ghọrọ onye nlekọta ụlọeze, na-achịkwa ndị ala ahụ. 22Ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ụzaya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, onye amụma Aịzaya nwa Emọz deturu ha nʼakwụkwọ. 23Ụzaya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼọhịa ebe a na-eli ozu nke dịịrị ndị eze, maka na ndị mmadụ sịrị, “Ọ bụ onye ekpenta.” Jotam nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 26:1 Onye a na-akpọkwa Azaraya

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.