Native Bible

2 Chronicles 26:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha guzogidere eze bụ Ụzaya, sị ya, “Ụzaya, i kwesighị ịbata nʼebe a jiri aka gị suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. Nke a bụ ọrụ dịrị naanị ndị nchụaja ndị bụ ụmụ Erọn, ndị a họpụtara doo iche maka ọrụ a. Site nʼebe nsọ a pụọ, nʼihi na i gosila onwe gị dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Ọzọ ị gaghị enwekwa nsọpụrụ site nʼaka Onyenwe anyị Chineke gị.”

2 Chronicles 26:18 in English

2 Chronicles 26:18 · Berean Standard Bible

They took their stand against King Uzziah and said, “Uzziah, you have no right to offer incense to the LORD. Only the priests, the descendants of Aaron, are consecrated to burn incense. Leave the sanctuary, for you have acted unfaithfully; you will not receive honor from the LORD God.”

Context

16Ma mgbe Ụzaya ghọrọ onye dị ike, nganga wetaara ya ọdịda. Ọ bụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ Chineke ya, ọ banyere nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ chụọ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja. 17Azaraya onye nchụaja na ndị nchụaja Onyenwe anyị iri asatọ ọzọ bụ dimkpa jekwuru ya nʼebe ahụ. 18Ha guzogidere eze bụ Ụzaya, sị ya, “Ụzaya, i kwesighị ịbata nʼebe a jiri aka gị suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. Nke a bụ ọrụ dịrị naanị ndị nchụaja ndị bụ ụmụ Erọn, ndị a họpụtara doo iche maka ọrụ a. Site nʼebe nsọ a pụọ, nʼihi na i gosila onwe gị dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Ọzọ ị gaghị enwekwa nsọpụrụ site nʼaka Onyenwe anyị Chineke gị.” 19Ụzaya onye ji ihe ịgụ ọkụ nke e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ ahụ nʼaka, were iwe nke ukwu megide ndị nchụaja ahụ. Mgbe ọ nọ na-abara ndị nchụaja mba nʼihu ebe ịchụ aja nke dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, lee ekpenta pụtara ya nʼegedege ihu. 20Mgbe Azaraya onyeisi nchụaja, na ndị nchụaja ọzọ niile lere ya anya, ha hụrụ na ekpenta agbaala ya nʼegedege ihu ya, ha mere ka ọ site nʼebe ahụ pụọ ngwangwa. Ya onwe ya kwa chọkwara isite nʼebe ahụ pụọ ngwangwa, nʼihi na Onyenwe anyị tiri ya ihe otiti.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.