Native Bible

2 Chronicles 26:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụzaya nyere ndị agha niile, ọta, na ùbe, na uwe agha, na okpu igwe, na uwe agha igwe, ụta na nkume na-akwọ mụrụmụrụ, nke ndị na-atụ iche ji alụ ọgụ.

2 Chronicles 26:14 in English

2 Chronicles 26:14 · Berean Standard Bible

Uzziah supplied the entire army with shields, spears, helmets, armor, bows, and slingstones.

Context

12Ndị agha a nwekwara puku ndịisi agha abụọ na narị isii, ya bụ 2,600. 13Ọnụọgụgụ ndị agha ahụ niile dị narị puku atọ na asaa, na narị ise, ya bụ, 307,500. Ha bụ ndị a zụziri nke ọma, ndị dị nnọọ ike iguzo nʼazụ eze ibu agha megide ndị iro ya. 14Ụzaya nyere ndị agha niile, ọta, na ùbe, na uwe agha, na okpu igwe, na uwe agha igwe, ụta na nkume na-akwọ mụrụmụrụ, nke ndị na-atụ iche ji alụ ọgụ. 15O mepụtakwara ihe nchepụta ọhụrụ na Jerusalem, nke ndị nwere amamihe chepụtara, bụ nke a ga-eguzobe nʼụlọ elu nche nakwa nʼelu nkuku mgbidi, ka ndị agha nwee ike jiri ha gbaa àkụ maọbụ tụọ nkume ukwu site nʼelu mgbidi ahụ niile. Ude aha ya gbasara ruo ebe dị anya, nʼihi na-enyeere ya aka nʼụzọ dị ukwuu ruo mgbe ọ ghọrọ onye dị ike. 16Ma mgbe Ụzaya ghọrọ onye dị ike, nganga wetaara ya ọdịda. Ọ bụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ Chineke ya, ọ banyere nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ chụọ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.