2 Ihe E Mere 25:18
2 Chronicles 25:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Jehoash eze Izrel, zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda, sị; “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ zọpịa uke ahụ.
2 Chronicles 25:18 in English
2 Chronicles 25:18 · Berean Standard Bible
But Jehoash king of Israel replied to Amaziah king of Judah: “A thistle in Lebanon sent a message to a cedar in Lebanon, saying, ‘Give your daughter to my son in marriage.’ Then a wild beast in Lebanon came along and trampled the thistle.
Context
16Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ ya, eze sịrị ya; “Mechie ọnụ! Ị chọrọ ịnwụ? Ole mgbe ka anyị mere gị onye na-adụ eze ọdụ?”
Ya mere, onye amụma ahụ kwụsịrị, ma sị, “Amaara m na Chineke ekpebiela ịla gị nʼiyi, nʼihi na i mere nke a ma jụkwa ige ntị na ndụmọdụ m.” 17Emesịa, mgbe Amazaya, eze Juda gbachara izu ya na ndị ndụmọdụ ya, o zigara Jehoash nwa Jehoahaz, nwa Jehu, eze Izrel ozi ịma aka, sị, “Bịa ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.” 18Ma Jehoash eze Izrel, zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda, sị; “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ zọpịa uke ahụ. 19Ị na-asị onwe gị, na i meriela Edọm, ugbu a, mpako abatala, isi a na-ebu gị. Ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?” 20Ma Amazaya egeghị ntị, nʼihi na Chineke na-akwado inyefe ya nʼaka Jehoash onye iro ha, nʼihi na ha chọrọ chi ndị Edọm gawa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.