Native Bible

2 Chronicles 25:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị agha Juda nwudoro puku ndị ikom iri ọzọ na ndụ, duru ha gaa nʼelu nkume dị elu, si nʼebe ahụ tụda ha niile, nke mere na ha niile kụpịasịrị.

2 Chronicles 25:12 in English

2 Chronicles 25:12 · Berean Standard Bible

and the army of Judah also captured 10,000 men alive. They took them to the top of a cliff and threw them down so that all were dashed to pieces.

Context

10Amazaya zighachiri ndị agha Izrel ahụ azụ ka ha laa, bụ ndị a si nʼIfrem bịakwute ya. Ha were iwe nke ukwuu megide Juda, jirikwa oke iwe laghachi nʼụlọ ha. 11Amazaya duuru ndị agha ya gaa na Ndagwurugwu Nnu, ebe o gburu ndị ikom Sia dị puku iri. 12Ndị agha Juda nwudoro puku ndị ikom iri ọzọ na ndụ, duru ha gaa nʼelu nkume dị elu, si nʼebe ahụ tụda ha niile, nke mere na ha niile kụpịasịrị. 13Ma ndị agha ahụ Amazaya zilagara, ka ha ghara iso ya gaa agha, wakporo ọtụtụ obodo ndị Juda site na Sameria ruo Bet-Horon. Ha gburu puku mmadụ atọ nʼime ha, bukọrọkwa ọtụtụ ihe nkwata nʼagha, buru ha laa. 14Mgbe Amazaya sitere nʼagha ebe o gburu ọtụtụ ndị Edọm lọta, o bulatara chi* nke ndị Sia. O guzobere ha dịka chi ndị nke aka ya, kpọọ isiala nye ha ma surekwa aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.