2 Ihe E Mere 24:26
2 Chronicles 24:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị gbara izu gbuo ya bụ Zabad, onye nne ya bụ Shimeat onye Amọn, na Jehozabad, onye nne ya bụ Shimrit onye Moab.
2 Chronicles 24:26 in English
2 Chronicles 24:26 · Berean Standard Bible
Those who conspired against Joash were Zabad * son of Shimeath the Ammonitess and Jehozabad son of Shimrith * the Moabitess.
Context
24Nʼagbanyeghị na ndị Aram kpọọ naanị ndị ikom ole na ole bịa, Onyenwe anyị raara igwe ndị agha dị ukwuu ranye ha nʼaka. Nʼihi na Juda gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke nke nna nna ha, e mezuru ihe niile e kpere nʼikpe nʼahụ Joash. 25Mgbe ndị agha Aram lara, hapụ Joash nʼọnọdụ mmerụ ahụ dị ukwuu, ndịisi ozi ya gbara izu gbuo ya, nʼihi ogbugbu o gburu nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ha gburu ya mgbe o dina nʼihe ndina ya. Emesịa, ha liri ya nʼobodo Devid, ma ọ bụghị nʼebe a na-eli ndị eze. 26Ndị gbara izu gbuo ya bụ Zabad, onye nne ya bụ Shimeat onye Amọn, na Jehozabad, onye nne ya bụ Shimrit onye Moab. 27Ihe niile gbasara Joash na ụmụ ya, na amụma niile e buru banyere ya, na otu e si wuzie ụlọnsọ ukwu Chineke, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel niile. Mgbe Joash nwụrụ, Amazaya nwa ya ghọrọ eze Juda.
24:12 Ya bụ, kapinta
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.