2 Ihe E Mere 23:3
2 Chronicles 23:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ọgbakọ ahụ niile na eze gbara ndụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Mgbe ahụ, Jehoiada sịrị ha, “Nwa eze ga-achị dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa banyere agbụrụ Devid.
2 Chronicles 23:3 in English
2 Chronicles 23:3 · Berean Standard Bible
the whole assembly made a covenant with the king in the house of God. “Behold, the king’s son!” said Jehoiada. “He must reign, just as the LORD promised concerning the descendants of David.
Context
1Nʼafọ nke asaa, Jehoiada gosiri ịdị ike nke obi ya. Ya na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha gbara ndụ. Ndị a bụ: Azaraya nwa Jeroham, Ishmel nwa Jehohanan, Azaraya nwa Obed, Maaseia nwa Adaya na Elishafat nwa Zikri. 2Ha pụrụ gaa akụkụ niile nke ala Juda kpọkọta ndị Livayị na ndịisi ezinaụlọ Izrel site nʼobodo niile. Mgbe ha bịarutere Jerusalem, 3ọgbakọ ahụ niile na eze gbara ndụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke.
Mgbe ahụ, Jehoiada sịrị ha, “Nwa eze ga-achị dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa banyere agbụrụ Devid. 4Ugbu a, nke a bụ ihe unu ga-eme: Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị nchụaja na ndị Livayị, bụ ndị ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike ga-abụ ndị ga-eche ọnụ ụzọ niile nche. 5Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ọzọ ga-anọ nʼụlọeze, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Ntọala. Ndị ọzọ niile ga-anọ gburugburu mpụta ụlọnsọ Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.