Native Bible

2 Chronicles 21:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze.

2 Chronicles 21:8 in English

2 Chronicles 21:8 · Berean Standard Bible

In the days of Jehoram, Edom rebelled against the hand of Judah and appointed their own king.

Context

6O soro ụzọ ndị eze Izrel, dịka ụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ ada Ehab. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. 7Ma nʼagbanyeghị nke a, Onyenwe anyị achọghị ibibi ụlọ Devid, nʼihi ọgbụgba ndụ ahụ Onyenwe anyị na Devid nwere. Nʼihi na o kwere ya nkwa ime ka oriọna dịịrị ya na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 8Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze. 9Ya mere, Jehoram duuru ndịisi agha ya na ụgbọ agha ya niile gaa nʼebe ahụ. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu. 10Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa. Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ, nʼihi na Jehoram gbakụtara Onyenwe anyị Chineke nna nna ya ha azụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.