2 Ihe E Mere 21:15
2 Chronicles 21:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị onwe gị kwa ga-ada nʼoke ọrịa, ọrịa afọ nke na-agaghị ekwe ngwọta. Ọrịa a ga-eme ka eriri afọ gị na-enupụta kwa ụbọchị.’ ”
2 Chronicles 21:15 in English
2 Chronicles 21:15 · Berean Standard Bible
And day after day you yourself will suffer from a severe illness, a disease of your bowels, until it causes your bowels to come out.’”
Context
13kama ị sooro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, meekwa ka ndị Juda na ndị Jerusalem fee chi ọzọ, dịka ụlọ Ehab mere. Ị gbuola ụmụnne nke gị, ndị bụ ndị si nʼezinaụlọ nke gị onwe gị, ndị ikom bụ ndị dị mma karịa gị. 14Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị ga-eji ihe otiti nke ọrịa tie ndị gị, ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye gị, na ihe niile i nwere. 15Gị onwe gị kwa ga-ada nʼoke ọrịa, ọrịa afọ nke na-agaghị ekwe ngwọta. Ọrịa a ga-eme ka eriri afọ gị na-enupụta kwa ụbọchị.’ ” 16Onyenwe anyị mekwara ka ndị Filistia, na ndị Arab, ndị bi nso ndị Kush, bịa lụso Jehoram agha. 17Ha ji ike bata Juda, buru ihe niile dị mma ha hụrụ nʼụlọeze, tinyere ụmụ nwoke ya niile na ndị nwunye ya niile. Ọ bụ naanị Ahazaya, nwa ya nwoke nke nta ka ha hapụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.