2 Ihe E Mere 20:22
2 Chronicles 20:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị Juda malitere ịbụ abụ na ito otuto, Onyenwe anyị cheere ndị agha Amọn na nke ndị Moab, na ndị nke si nʼugwu Sia nʼụzọ, merie ha.
2 Chronicles 20:22 in English
2 Chronicles 20:22 · Berean Standard Bible
The moment they began their shouts and praises, the LORD set ambushes against the men of Ammon, Moab, and Mount Seir who had come against Judah, and they were defeated.
Context
20Nʼisi ụtụtụ, ha pụrụ gawa nʼọzara Tekoa. Ma mgbe ha na-apụ, Jehoshafat guzoro ọtọ sị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem. Nweenụ okwukwe nʼime Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nwekwanụ ntụkwasị obi na ige ndị amụma ya ntị, ka ihe gaara unu nke ọma.” 21Mgbe ya na ndị ya gbasịrị izu, Jehoshafat họpụtara ndị ikom ndị ga-eji abụ too Onyenwe anyị nʼihi ebube ya na ịdị nsọ ya. Mgbe ha na-aga nʼihu ndị agha, ha na-abụ abụ na-asị:
“Nyenụ Onyenwe anyị ekele,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo ebighị ebi.” 22Mgbe ndị Juda malitere ịbụ abụ na ito otuto, Onyenwe anyị cheere ndị agha Amọn na nke ndị Moab, na ndị nke si nʼugwu Sia nʼụzọ, merie ha. 23Ma ndị agha Amọn na Moab buru ụzọ lụso ndị agha si nʼugwu Sia ọgụ. Mgbe ha lakwara onwe ha nʼiyi, ọgụ dakwara nʼetiti ndị Moab na Amọn. 24Mgbe ndị agha Juda rutere ebe ha ga-esi lepụ anya hụ ihe na-eme nʼọzara ahụ, ha lepụrụ anya ịhụ usuu ndị agha ahụ, ma ihe ha hụrụ bụ ozu ndị agha tọgbọcha nʼala. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị agha ahụ gbapụrụ na ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.