2 Ihe E Mere 20:19
2 Chronicles 20:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ kwa, ndị Livayị si nʼagbụrụ Kohat na Kora jiri ike ha niile too Onyenwe anyị Chineke Izrel nʼabụ.
2 Chronicles 20:19 in English
2 Chronicles 20:19 · Berean Standard Bible
And the Levites from the Kohathites and Korahites stood up to praise the LORD, the God of Israel, shouting in a very loud voice.
Context
17Ọ bụghị unu ka ọ dịrị ịlụ agha a, kama werenụ ọnọdụ unu, guzosienụ ike ka unu jiri anya unu hụ nzọpụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-enye unu, unu ndị Juda na Jerusalem. Unu atụla egwu, unu adakwala mba. Pụkwuru ha nʼihu agha mgbe chi echi bọrọ, Onyenwe anyị ga-anọnyekwara unu.’ ” 18Mgbe ahụ, Jehoshafat, na ndị Juda na ndị Jerusalem niile dara nʼala kelee Onyenwe anyị, kpọọ isiala nye ya. 19Mgbe ahụ kwa, ndị Livayị si nʼagbụrụ Kohat na Kora jiri ike ha niile too Onyenwe anyị Chineke Izrel nʼabụ. 20Nʼisi ụtụtụ, ha pụrụ gawa nʼọzara Tekoa. Ma mgbe ha na-apụ, Jehoshafat guzoro ọtọ sị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem. Nweenụ okwukwe nʼime Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nwekwanụ ntụkwasị obi na ige ndị amụma ya ntị, ka ihe gaara unu nke ọma.” 21Mgbe ya na ndị ya gbasịrị izu, Jehoshafat họpụtara ndị ikom ndị ga-eji abụ too Onyenwe anyị nʼihi ebube ya na ịdị nsọ ya. Mgbe ha na-aga nʼihu ndị agha, ha na-abụ abụ na-asị:
“Nyenụ Onyenwe anyị ekele,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo ebighị ebi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.