Native Bible

2 Chronicles 2:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Zitekwara m osisi sida, na osisi junipa, na osisi algụm, ndị sitere nʼọhịa Lebanọn, nʼihi na ndị gị bụ ọkachamara nʼọrụ ịwa osisi. Aga m ezitekwa ndị m ga-abịa soro ha rụọ ọrụ,

2 Chronicles 2:8 in English

2 Chronicles 2:8 · Berean Standard Bible

Send me also cedar, cypress,* and algum * logs from Lebanon, for I know that your servants have skill to cut timber there. And indeed, my servants will work with yours

Context

6Ma onye pụrụ iwu ụlọnsọ nye ya, ebe ọ bụ na eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị? Onye ka mụ onwe m bụ, na m ga-ewu ụlọnsọ nye ya, ma ọ bụghị naanị ebe a ga-anọ chụọ aja dị iche iche nʼihu ya? 7“Zitere m, onye ǹka, onye maara otu e si eji ọlaedo na ọlaọcha, na bronz, na igwe arụ ọrụ. Onye bụkwa onye maara ọrụ ǹka metụtara akwa dị iche iche, akwa ngwakọta anụnụ na uhie, na nke uhie uhie, na nke anụnụ anụnụ. Ọ ga-abụkwa onye igbunye akara nʼihe doro anya, onye ga-arụ ọrụ na Juda na nʼime Jerusalem, ebe ọ ga-eso ndị ǹka m, bụ ndị nna m Devid họpụtara rụọ ọrụ. 8“Zitekwara m osisi sida, na osisi junipa, na osisi algụm, ndị sitere nʼọhịa Lebanọn, nʼihi na ndị gị bụ ọkachamara nʼọrụ ịwa osisi. Aga m ezitekwa ndị m ga-abịa soro ha rụọ ọrụ, 9ime ka osisi ha ga-egbutere m dị ukwuu, nʼihi na ya bụ ụlọnsọ ga-ebu ibu, maakwa mma. 10Aga m enye ndị ọrụ gị, bụ ndị na-awa osisi, narị puku bushel na iri puku bushel ọka wiiti abụọ a kwọrọ akwọ, na narị puku bushel na iri puku bushel ọka balị abụọ, na narị puku galọọnụ ite mmanya vaịnị na iri galọọnụ abụọ, nakwa narị puku galọọnụ mmanụ na iri galọọnụ mmanụ oliv abụọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.