2 Ihe E Mere 2:15
2 Chronicles 2:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ugbu a, ka onyenwe m zitere ndị ohu ya ọka wiiti ahụ, na ọka balị, na mmanya vaịnị, na mmanụ oliv, dịka ọ kwere na nkwa.
2 Chronicles 2:15 in English
2 Chronicles 2:15 · Berean Standard Bible
Now let my lord send to his servants the wheat, barley, olive oil, and wine he promised.
Context
13“Ana m ezitere gị Huram-Abi, onye ọka maara ọrụ ya nke ọma. 14Onye nne ya si nʼebo Dan nke dị nʼIzrel, ma nna ya bụ onye Taịa. Ọ bụ onye a zụrụ nʼọrụ ịkpụ ụzụ nke ọma, nʼihe gbasara ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, na nkume, na osisi. Ọ makwa otu e si eji akwa odo odo, na akwa anụnụ anụnụ, na akwa uhie uhie na ezi akwa ọcha arụ ọrụ. Igbunye ụdị akara ọbụla nʼihe nakwa ichepụta ihe ọ ga-eji ihe ọbụla enyere ya mee doro ya anya nke ọma. Ọ ga-esonye ndị ǹka gị, na ndị nke onyenwe m Devid, bụ nna gị. 15“Ugbu a, ka onyenwe m zitere ndị ohu ya ọka wiiti ahụ, na ọka balị, na mmanya vaịnị, na mmanụ oliv, dịka ọ kwere na nkwa. 16Anyị ga-egbutu osisi niile ị chọrọ site nʼugwu Lebanọn, sitekwa nʼosimiri budata ha obodo Jopa, ebe i nwere ike isite buruo ha Jerusalem.” 17Emesịa, Solomọn gụrụ ndị ọbịa niile bi nʼala Izrel ọnụ, dịka Devid mere, achọpụtara na ha dị narị puku iri ise na atọ, na narị isii (153,600).
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.