Native Bible

2 Chronicles 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hiram kwukwara sị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Onye kere eluigwe na ụwa. Onye nyere Devid, bụ eze, nwa nwere nghọta na akọnuche dị otu a, iwuru Onyenwe anyị ebe obibi, na iwukwa ụlọeze nke aka ya.

2 Chronicles 2:12 in English

2 Chronicles 2:12 · Berean Standard Bible

And Hiram added: “Blessed be the LORD, the God of Israel, who made the heavens and the earth! He has given King David a wise son with insight and understanding, who will build a temple for the LORD and a royal palace for himself.

Context

10Aga m enye ndị ọrụ gị, bụ ndị na-awa osisi, narị puku bushel na iri puku bushel ọka wiiti abụọ a kwọrọ akwọ, na narị puku bushel na iri puku bushel ọka balị abụọ, na narị puku galọọnụ ite mmanya vaịnị na iri galọọnụ abụọ, nakwa narị puku galọọnụ mmanụ na iri galọọnụ mmanụ oliv abụọ.” 11Hiram, eze Taịa zighachiiri Solomọn akwụkwọ ozi sị ya. “Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị hụrụ ndị ya nʼanya ka o ji mee gị eze ha.” 12Hiram kwukwara sị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Onye kere eluigwe na ụwa. Onye nyere Devid, bụ eze, nwa nwere nghọta na akọnuche dị otu a, iwuru Onyenwe anyị ebe obibi, na iwukwa ụlọeze nke aka ya. 13“Ana m ezitere gị Huram-Abi, onye ọka maara ọrụ ya nke ọma. 14Onye nne ya si nʼebo Dan nke dị nʼIzrel, ma nna ya bụ onye Taịa. Ọ bụ onye a zụrụ nʼọrụ ịkpụ ụzụ nke ọma, nʼihe gbasara ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, na nkume, na osisi. Ọ makwa otu e si eji akwa odo odo, na akwa anụnụ anụnụ, na akwa uhie uhie na ezi akwa ọcha arụ ọrụ. Igbunye ụdị akara ọbụla nʼihe nakwa ichepụta ihe ọ ga-eji ihe ọbụla enyere ya mee doro ya anya nke ọma. Ọ ga-esonye ndị ǹka gị, na ndị nke onyenwe m Devid, bụ nna gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.