Native Bible

2 Chronicles 19:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jehoshafat biri na Jerusalem. Ọ pụrụ gagharịa nʼetiti ndị ya site na Bịasheba ruo nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, laghachikwutekwa Onyenwe anyị, bụ Chineke nke nna nna ha.

2 Chronicles 19:4 in English

2 Chronicles 19:4 · Berean Standard Bible

Jehoshaphat lived in Jerusalem, and once again he went out among the people from Beersheba to the hill country of Ephraim and turned them back to the LORD, the God of their fathers.

Context

2Jehu nwa Hanani, onye ọhụ ọhụ, pụrụ gaa izute ya; ọ sịrị eze Jehoshafat, “O kwesiri ka i nyere onye ọjọọ aka? Ọ bụkwa ndị na-akpọ Onyenwe anyị asị ka ị na-ahụ nʼanya? Nʼihi nke a iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla gị. 3Ma otu ọ dị, achọtara ezi ihe nʼime gị, i sitela nʼala a wezuga ogidi Ashera niile, dozieekwa obi gị ịchọ Chineke.” 4Jehoshafat biri na Jerusalem. Ọ pụrụ gagharịa nʼetiti ndị ya site na Bịasheba ruo nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, laghachikwutekwa Onyenwe anyị, bụ Chineke nke nna nna ha. 5Ọ họpụtara ndị ikpe nʼala ahụ, nʼotu nʼotu nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike nke Juda. 6Ọ gwara ha si, “Lezienụ anya ihe unu na-eme nʼihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Onyenwe anyị, onye na-anọnyere unu mgbe unu na-ekpebi ikpe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.