2 Ihe E Mere 18:27
2 Chronicles 18:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị Onyenwe anyị si nʼọnụ m kwuo okwu.” O kwukwara sị, “Unu niile, hụbakwanụ okwu m ndị a niile ama.”
2 Chronicles 18:27 in English
2 Chronicles 18:27 · Berean Standard Bible
But Micaiah replied, “If you ever return safely, the LORD has not spoken through me.” Then he added, “Take heed, all you people!”
Context
25Eze Izrel nyere iwu sị, “Jidenụ Maikaya kpụgara ya Amọn, onye na-achị obodo a, na Joash, nwa eze. 26Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka eze sịrị: Tinye nwoke a nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri ọṅụṅụ tutu ruo mgbe m lọghachiri nʼudo.’ ” 27Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị Onyenwe anyị si nʼọnụ m kwuo okwu.” O kwukwara sị, “Unu niile, hụbakwanụ okwu m ndị a niile ama.” 28Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda pụrụ gawa Ramọt Gilead. 29Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.