2 Ihe E Mere 16:11
2 Chronicles 16:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe banyere ihe ọzọ niile nʼoge ọchịchị Asa, site na mmalite ruo ọgwụgwụ ka e dere nʼime akwụkwọ ndị eze Juda na Izrel.
2 Chronicles 16:11 in English
2 Chronicles 16:11 · Berean Standard Bible
Now the rest of the acts of Asa, from beginning to end, are indeed written in the Book of the Kings of Judah and Israel.
Context
9Nʼihi na anya Onyenwe anyị na-agazu ụwa niile, ịgba ha ume bụ ndị obi ha zuruoke nʼebe ọ nọ. I meela omume nzuzu na nke a, site ugbu a gaa nʼihu ị ga na-enwe agha.” 10Iwe were Asa megide onye ọhụ ụzọ a nʼihi nke a; iwe were ya nke ukwuu nke mere na ọ tụnyere Hanani nʼụlọ mkpọrọ. Sitekwa nʼoge ahụ, Asa bidoro imekpa ụfọdụ nʼime ndị ya ahụ. 11Ihe banyere ihe ọzọ niile nʼoge ọchịchị Asa, site na mmalite ruo ọgwụgwụ ka e dere nʼime akwụkwọ ndị eze Juda na Izrel. 12Nʼime iri afọ atọ na itoolu nke ọchịchị ya, eze Asa rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ. Ọ bụ ezie na ọrịa a siri nọọ ike ma nʼime ọnọdụ ya ọ chọghị enyemaka site nʼaka Onyenwe anyị kama ọ bụ naanị ndị dibịa ka o jekwuru. 13Asa nwụrụ nʼiri afọ anọ na otu nke ọchịchị eze ya, sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.