2 Ihe E Mere 14:9
2 Chronicles 14:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Zera, bụ onye Kush duru puku kwụrụ puku,* na narị ụgbọ agha atọ, bịaruo Maresha ibuso Juda agha.
2 Chronicles 14:9 in English
2 Chronicles 14:9 · Berean Standard Bible
Then Zerah the Cushite came against them with an army of 1,000,000 men * and 300 chariots, and they advanced as far as Mareshah.
Context
7Nʼihi nke a, ọ gwara ndị Juda sị ha, “Ugbu a ka anyị kwesiri iwu obodo ndị a. Ka anyị wuokwa mgbidi gburugburu ha, wuokwa ụlọ elu nche, tinyesịa ha niile ibo ọnụ ụzọ ama, na mkpọrọ e ji akpọchi ya, ala a bụ nke anyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye anyị ji obi anyị chọsie ike enyela anyị udo.” Ya mere, ha wuru ihe ndị a niile nwekwa ọganihu. 8Ọnụọgụgụ ndị agha Asa ndị si Juda nʼoge ahụ bụ narị puku atọ. Ngwa agha ha ji bụ ọta ukwu na ùbe. Ndị agha ya ọzọ si Benjamin dị narị puku abụọ na iri puku mmadụ asatọ. Ndị a jikwa ọta na ụta. Ndị agha ndị a niile bụ ndị a zụziri azụzi, bụrụkwa ndị dị ike. 9Zera, bụ onye Kush duru puku kwụrụ puku,* na narị ụgbọ agha atọ, bịaruo Maresha ibuso Juda agha. 10Asa pụrụ izute ya. Ha doro onwe ha nʼusoro ibu agha na Ndagwurugwu Zefata nke dị Maresha nso. 11Mgbe ahụ, Asa kpọkuru Onyenwe anyị Chineke ya, si, “Onyenwe anyị ọ dịghị onye dịka gị nʼinyere onye na-adịghị ike aka nʼihu onye dị ike nke ukwuu. Nyere anyị aka, O Onyenwe anyị Chineke anyị, nʼihi na anyị dabere na gị. Ọ bụkwa nʼaha gị ka anyị na-apụ ibuso igwe a agha. O Onyenwe anyị i bụ Chineke anyị. Ekwela ka ọ bụrụ na mmadụ efu meriri gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.