Native Bible

2 Chronicles 13:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị efu niile na-abaghị uru chịkọtara onwe ha gbaa ya gburugburu guzogide Rehoboam nwa Solomọn, mgbe ọ bụ nwantakịrị na onye na-enweghị ike inwe mkpebi, onye nʼadịghịkwa ike iguzogide ha.

2 Chronicles 13:7 in English

2 Chronicles 13:7 · Berean Standard Bible

Then worthless and wicked men gathered around him to resist Rehoboam son of Solomon when he was young, inexperienced, and unable to resist them.

Context

5Unu amataghị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel esitela nʼọgbụgba ndụ nnu nyefee ọchịchị ala Izrel niile nʼaka Devid na ụmụ ụmụ ya ruo ebighị ebi? 6Ma Jeroboam, nwa Nebat, bụ onye ọrụ Solomọn nwa Devid, nupuru isi megide onyenwe ya. 7Ndị efu niile na-abaghị uru chịkọtara onwe ha gbaa ya gburugburu guzogide Rehoboam nwa Solomọn, mgbe ọ bụ nwantakịrị na onye na-enweghị ike inwe mkpebi, onye nʼadịghịkwa ike iguzogide ha. 8“Ma ugbu a, unu ejikerela imegide alaeze Onyenwe anyị nke dị nʼaka ụmụ ụmụ Devid. Nʼezie, unu bu igwe ndị agha bara ụba, nʼetiti unu ka ụmụ ehi ọlaedo ahụ dịkwa, bụ nke Jeroboam mere ka ha buru chi unu. 9Ma unu achụpụghị ndị nchụaja Onyenwe anyị, bụ ụmụ Erọn, chụpụkwa ndị Livayị ma meere onwe unu ndị nchụaja dịka ndị mba ọzọ na-eme? Onye ọbụla ji nwa oke ehi na ebule asaa bịa ido onwe ya nsọ na-aghọrọ unu onye nchụaja nye ihe ndị ahụ na-abụghị chi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.