Native Bible

2 Chronicles 10:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ nabataghị ndụmọdụ ndị okenye nyere ya, ọ gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ, bụkwa ndị na-ejere ya ozi, ka ha nye ya ndụmọdụ.

2 Chronicles 10:8 in English

2 Chronicles 10:8 · Berean Standard Bible

But Rehoboam rejected the advice of the elders; instead, he consulted the young men who had grown up with him and served him.

Context

6Mgbe ahụ, eze Rehoboam gara ịnata ndụmọdụ nʼaka ndị okenye, bụ ndị jeere nna ya Solomọn ozi nʼoge ọ dị ndụ ya, sị ha, “Olee ndụmọdụ unu ga-enye m maka mụ inye ndị a ọsịsa?” 7Ha zara ya, “Ọ bụrụ na ị ga-emere ha ihe ọma, mee ihe ga-atọ ha ụtọ, nyekwa ha ọsịsa dị mma, ha ga-anọgide bụrụ ndị ohu gị mgbe niile.” 8Ma ọ nabataghị ndụmọdụ ndị okenye nyere ya, ọ gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ, bụkwa ndị na-ejere ya ozi, ka ha nye ya ndụmọdụ. 9Rehoboam jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ndụmọdụ unu? Gịnị bụ ọsịsa anyị ga-enye ndị a na-asị, ‘Mee ka ibu arọ nna gị bokwasịrị anyị dị mfe’? ” 10Ụmụ okorobịa ahụ, bụ ndị ya na ha tokọrọ, zaghachiri sị, “Gwa ndị ahụ sịrị gị, ‘Nna gị bokwasịrị anyị ibu arọ, ma mee ka ibu anyị dị mfe,’ ị ga-agwa ha, sị, ‘Mkpịsịaka nta dị nʼaka m gbara okpotokpo karịa ukwu nna m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.