2 Ihe E Mere 1:3
2 Chronicles 1:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Solomọn ya na ọgbakọ ahụ niile, gara nʼebe dị elu nke Gibiọn, nʼihi nʼebe ahụ ka ụlọ nzute Chineke dị, bụ nke Mosis onyeozi Onyenwe anyị wuru nʼọzara.
2 Chronicles 1:3 in English
2 Chronicles 1:3 · Berean Standard Bible
And Solomon and the whole assembly went to the high place at Gibeon because it was the location of God’s Tent of Meeting, which Moses the servant of the LORD had made in the wilderness.
Context
1Solomọn nwa Devid mere onwe ya ka o guzosie ike nʼalaeze ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ya nọnyeere ya, meekwa ka ọ dị ukwuu hie nne. 2Mgbe ahụ, Solomọn gwara ndị Izrel niile okwu, ya bụ, ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndị ikpe, na ndị ndu niile nọ nʼIzrel, na ndịisi ezinaụlọ niile. 3Solomọn ya na ọgbakọ ahụ niile, gara nʼebe dị elu nke Gibiọn, nʼihi nʼebe ahụ ka ụlọ nzute Chineke dị, bụ nke Mosis onyeozi Onyenwe anyị wuru nʼọzara. 4Ma Devid esitelarị na Kiriat Jearim buputa igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, bulaa ya nʼụlọ ikwu nke o wuru maka ya na Jerusalem. 5Ebe ịchụ aja bronz ahụ Bezalel nwa Uri, nwa Hua wuru dịkwa na Gibiọn, nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị. Solomọn na ọgbakọ ahụ na-ajụta ya ase nʼebe bronz ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.