2 Ihe E Mere 1:13
2 Chronicles 1:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Solomọn sitere nʼebe dị elu nke Gibiọn, site nʼihu ụlọ nzute ahụ, lọghachi na Jerusalem. Ọ chịrị dịka eze nʼIzrel.
2 Chronicles 1:13 in English
2 Chronicles 1:13 · Berean Standard Bible
So Solomon went to Jerusalem from the high place in Gibeon before the Tent of Meeting, and he reigned over Israel.
Context
11Chineke zara Solomọn sị ya, “Ebe ọ bụ na ị rịọghị m ka m nye gị akụnụba, maọbụ ogologo ndụ; ebe ọ bụkwa na ị rịọghị m ka m mee ka ndị kpọrọ gị asị nwụsịa, maọbụ ka m mee ka i nwee nsọpụrụ karịa, kama mkpa na-akpa gị bụ ka m nye gị amamihe na nghọta ị ga-eji duzie ndị m, nke m mere gị eze ha. 12Ya mere, enyela gị amamihe na nghọta dịka ị rịọrọ. Aga m enyekwa gị akụnụba na nsọpụrụ dị ukwuu, nke eze ọbụla nke buru gị ụzọ na-enwebeghị. Ọ dịkwaghị onye nke ga-eso gị ga-enwe ụdị ya.” 13Mgbe ahụ, Solomọn sitere nʼebe dị elu nke Gibiọn, site nʼihu ụlọ nzute ahụ, lọghachi na Jerusalem. Ọ chịrị dịka eze nʼIzrel. 14Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ. 15Eze mere ka ọlaọcha na ọlaedo baa ụba na Jerusalem, dịka nkume efu. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.