2 Ihe E Mere 1:10
2 Chronicles 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Biko, nye m amamihe na nghọta, nke m ga-eji edu ndị a napụ na-abata, nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?”
2 Chronicles 1:10 in English
2 Chronicles 1:10 · Berean Standard Bible
Now grant me wisdom and knowledge, so that I may lead this people.* For who is able to govern this great people of Yours?”
Context
8Ma Solomọn zara Chineke, sị, “I gosila nna m bụ Devid obi ebere dị ukwuu. Ugbu a, i meekwala m eze nʼọnọdụ ya 9Ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke, ka nkwa gị nke i kwere nna m, bụ Devid, bụrụ ihe e mezuru, nʼihi na ị meela m eze ndị a bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja nke ala. 10Biko, nye m amamihe na nghọta, nke m ga-eji edu ndị a napụ na-abata, nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?” 11Chineke zara Solomọn sị ya, “Ebe ọ bụ na ị rịọghị m ka m nye gị akụnụba, maọbụ ogologo ndụ; ebe ọ bụkwa na ị rịọghị m ka m mee ka ndị kpọrọ gị asị nwụsịa, maọbụ ka m mee ka i nwee nsọpụrụ karịa, kama mkpa na-akpa gị bụ ka m nye gị amamihe na nghọta ị ga-eji duzie ndị m, nke m mere gị eze ha. 12Ya mere, enyela gị amamihe na nghọta dịka ị rịọrọ. Aga m enyekwa gị akụnụba na nsọpụrụ dị ukwuu, nke eze ọbụla nke buru gị ụzọ na-enwebeghị. Ọ dịkwaghị onye nke ga-eso gị ga-enwe ụdị ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.