Native Bible

1 Timothy 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma anyị maara na iwu dị mma, ma ọ bụrụ na onye ọbụla ewere ya mee ihe a chọrọ ka e jiri ya mee.

1 Timothy 1:8 in English

1 Timothy 1:8 · Berean Standard Bible

Now we know that the law is good, if one uses it legitimately.

Context

6Ụfọdụ e sikwala nʼihe ndị a dapụ, jehie ụzọ, site nʼoke ịrụ ụka na-abaghị uru. 7Ha chọrọ ịbụ ndị ozizi iwu ma ha amaghị ihe ha na-ekwu maọbụ ihe ha na-akwadosi ike. 8Ma anyị maara na iwu dị mma, ma ọ bụrụ na onye ọbụla ewere ya mee ihe a chọrọ ka e jiri ya mee. 9Ma emeghị iwu nʼihi ndị ezi omume. Kama, e mere iwu nʼihi ndị ahụ na-emebi iwu na ndị na-enupu isi, ndị kpọrọ Chineke asị na ndị mmehie, ndị rụrụ arụ, ndị na-egbu nna ha na nne ha, na ndị na-egbu mmadụ ibe ha, 10na ndị na-akwa iko na ndị ikom na-emerụ onwe ha nʼahụ ndị ikom ibe ha, ndị na-azụ ahịa ndị ohu, na ndị ụgha niile, na ndị na-agba ama ụgha, tinyere ihe ndị ahụ niile megidere ezi ozizi ahụ,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.