Native Bible

1 Thessalonians 4:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, onye ọbụla nke jụrụ ịnara ntụziaka a, ọ bụghị mmadụ ka ọ jụrụ, kama ọ bụ Chineke onye na-enye unu Mmụọ Nsọ ya.

1 Thessalonians 4:8 in English

1 Thessalonians 4:8 · Berean Standard Bible

Anyone, then, who rejects this command does not reject man but God, the very One who gives you His Holy Spirit.

Context

6Ka onye ọbụla ghara imegbu maọbụ ịghọgbu nwanna ya nʼokwu a. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ata onye na-eme ihe dị otu a ahụhụ, dị ka anyị gwara unu na mbụ, na-adọsikwa unu aka na ntị ike. 7Nʼihi na ọkpụkpọ Chineke kpọrọ anyị abụghị ka anyị na-ebi ndụ adịghị ọcha kama ọ chọrọ ka anyị dịrị nsọ. 8Ya mere, onye ọbụla nke jụrụ ịnara ntụziaka a, ọ bụghị mmadụ ka ọ jụrụ, kama ọ bụ Chineke onye na-enye unu Mmụọ Nsọ ya. 9Ugbu a, ihe gbasara ịhụnanya nke kwesiri ịdị nʼetiti ụmụnna, o kwesighị ka anyị gwa unu ihe ọzọ banyere ya. Nʼihi na unu onwe unu bụ ndị Chineke kuziri ka unu nwee ịhụnanya nʼebe ibe unu nọ. 10Ma nʼezie, unu na-ahụ ụmụnna anyị niile bi na Masidonia nʼanya. Ma anyị na-arịọsịkwa unu arịrịọ ike sị unu na-ahụkwa ha nʼanya karịa ka unu hụrụ ha ugbu a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.