Native Bible

1 Thessalonians 3:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a anyị ga-adị ndụ, ma ọ bụrụ na unu eguzosie ike nʼime Onyenwe anyị.

1 Thessalonians 3:8 in English

1 Thessalonians 3:8 · Berean Standard Bible

For now we can go on living, as long as you are standing firm in the Lord.

Context

6Ma ugbu a, Timoti esitela nʼebe unu nọ lọghachikwute anyị. O wetara oziọma banyere okwukwe unu na ịhụnanya unu. O mekwara ka anyị mata na unu na-enwe ezi ncheta banyere anyị mgbe niile, na ọ na-agụsị unu agụụ ike ịhụ anyị anya, dị ka o si agụkwa anyị ịhụ unu anya. 7Nʼihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a gbara ume nke ukwuu, ọ bụladị nʼime mkpagbu niile nke anyị nọ nʼime ya, nʼihi iguzosi ike nke unu guzoro nʼokwukwe unu. 8Ugbu a anyị ga-adị ndụ, ma ọ bụrụ na unu eguzosie ike nʼime Onyenwe anyị. 9Olee ụdị ekele anyị pụrụ ikele Chineke nʼihi akụkọ nyere anyị ọṅụ nʼihu Chineke anyị nʼihi unu. 10Ehihie na abalị niile, anyị na-arịọ ka anyị hụ unu ihu na ihu, ka anyị nwee ike tinyezuo ihe fọdụrụ nʼokwukwe unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.