1 Samuel 9:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Sọl sịrị odibo ya, “Ọ bụrụ na anyị agaa, gịnị ka anyị ga-enye nwoke ahụ? Nri dị na-akpa anyị agwụla, ọ dịkwaghị onyinye anyị nwere nke anyị ga-enye onye nke Chineke. Gịnị ka anyị nwere?”
1 Samuel 9:7 in English
1 Samuel 9:7 · Berean Standard Bible
“If we do go,” Saul replied, “what can we give the man? For the bread in our packs is gone, and there is no gift to take to the man of God. What do we have?”
Context
5Nʼikpeazụ, mgbe ha chọọrọ ha rute nʼala Zuf, Sọl gwara onyeozi ahụ ya na ya so, sị, “Ka anyị laghachi, nʼihi na ọ bụrụ na nna m elee anya anyị ma ọ hụghị anyị, ọ ga-amalite iche echiche banyere anyị karịa ịnyịnya ibu ndị a.” 6Ma odibo ahụ zara ya sị, “Lee, e nwere otu onye nke Chineke bi nʼobodo a; ọ bụkwa onye mmadụ niile na-asọpụrụ nʼihi na ihe ọbụla o kwuru na-emezu. Ka anyị gaa hụ ya, ma eleghị anya ọ ga-agwa anyị ụzọ anyị ga-esi.” 7Sọl sịrị odibo ya, “Ọ bụrụ na anyị agaa, gịnị ka anyị ga-enye nwoke ahụ? Nri dị na-akpa anyị agwụla, ọ dịkwaghị onyinye anyị nwere nke anyị ga-enye onye nke Chineke. Gịnị ka anyị nwere?” 8Onyeozi ahụ zara ya ọzọ sị, “Lee, enwere m otu mkpụrụ shekel ọlaọcha. Aga m enye ya onye Chineke a ka ọ gwa anyị ụzọ anyị ga-esi.” 9(Na mgbe gara aga nʼIzrel, ọ bụrụ na mmadụ agaa iju Chineke ase, ọ na-asị, “Bịa ka anyị jekwuru onye ọhụ ụzọ,” nʼihi na onye a na-akpọ onye amụma taa, ka a na-akpọ onye ọhụ ụzọ nʼoge ahụ).
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.