1 Samuel 9:22
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Samuel duuru Sọl na onyeozi ya kpọbata ha nʼime ụlọ ukwu, nye ha ọnọdụ nʼisi oche nʼetiti iri mmadụ atọ ọ kpọrọ oriri.
1 Samuel 9:22 in English
1 Samuel 9:22 · Berean Standard Bible
Then Samuel took Saul and his servant, brought them into the hall, and seated them in the place of honor among those who were invited—about thirty in all.
Context
20Enyela obi gị nsogbu maka ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu nʼabalị atọ gara aga, nʼihi na a chọtala ha. Ma, onye ka mmadụ ahụ bụ, onye ndị Izrel niile na-achọsi ike? Ọ bụghị gị na ezinaụlọ nna gị.” 21Ma Sọl zara sị, “Ọ bụghị onye Benjamin ka m bụ, onye sitere nʼebo kachasị nta nʼIzrel; ọ bụghị agbụrụ m dịkarịsịrị nta nʼetiti agbụrụ niile ọzọ dị nʼebo Benjamin? Gịnị mere i ji agwa m ụdị okwu dị otu a?” 22Mgbe ahụ, Samuel duuru Sọl na onyeozi ya kpọbata ha nʼime ụlọ ukwu, nye ha ọnọdụ nʼisi oche nʼetiti iri mmadụ atọ ọ kpọrọ oriri. 23Samuel gwara onyeisi ndị na-esi nri okwu sị, “Weta anụ ahụ m nyere gị, nke ahụ m sị gị ka ị debe iche.” 24Onye na-esi nri weere ụkwụ anụ ahụ na ihe ndị so ya debe ya nʼihu Sọl. Samuel sịrị, “Lee, ihe ndị e wepụrụ ka e debere gị. Rie, nʼihi na e debere gị ya maka oge akara aka, site nʼoge ahụ m kwuru si, ‘Akpọrọ m ndị mmadụ oku nri.’ ” Sọl sooro Samuel rie nri nʼụbọchị ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.