1 Samuel 9:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Samuel zara sị ya, “Mụ onwe m bụ ọhụ ụzọ ahụ. Gaanụ nʼihu m rigoruo nʼebe dị elu, nʼihi na mụ na unu ga-eso rikọọ nri taa. Nʼụtụtụ echi aga m agwa gị ihe dị gị nʼobi. Aga m ezilagakwa gị.
1 Samuel 9:19 in English
1 Samuel 9:19 · Berean Standard Bible
“I am the seer,” Samuel replied. “Go up before me to the high place, for you shall eat with me today. And when I send you off in the morning, I will tell you all that is in your heart.
Context
17Mgbe Samuel hụrụ Sọl, Onyenwe anyị gwara ya sị, “Lee nwoke ahụ m gwara gị ihe banyere ya! Ọ bụ ya ga-achị ndị m.” 18Ma Sọl bịaruru Samuel nso jụọ ya sị, “Biko, zi m ebe ụlọ onye ọhụ ụzọ dị.” 19Samuel zara sị ya, “Mụ onwe m bụ ọhụ ụzọ ahụ. Gaanụ nʼihu m rigoruo nʼebe dị elu, nʼihi na mụ na unu ga-eso rikọọ nri taa. Nʼụtụtụ echi aga m agwa gị ihe dị gị nʼobi. Aga m ezilagakwa gị. 20Enyela obi gị nsogbu maka ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu nʼabalị atọ gara aga, nʼihi na a chọtala ha. Ma, onye ka mmadụ ahụ bụ, onye ndị Izrel niile na-achọsi ike? Ọ bụghị gị na ezinaụlọ nna gị.” 21Ma Sọl zara sị, “Ọ bụghị onye Benjamin ka m bụ, onye sitere nʼebo kachasị nta nʼIzrel; ọ bụghị agbụrụ m dịkarịsịrị nta nʼetiti agbụrụ niile ọzọ dị nʼebo Benjamin? Gịnị mere i ji agwa m ụdị okwu dị otu a?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.