Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nʼụbọchị bọrọ tupu ụbọchị Sọl na-abịa, Onyenwe anyị kpughere nke a nye Samuel.

1 Samuel 9:15 in English

1 Samuel 9:15 · Berean Standard Bible

Now on the day before Saul’s arrival, the LORD had revealed to Samuel,

Context

13Ngwangwa unu banye nʼobodo, unu ga-ahụ ya tupu o gaa nʼebe dị elu iri ihe. Nʼihi na ndị mmadụ agaghị ebido iri ihe tutu ruo mgbe o rutere, nʼihi na ọ ghaghị ịgọzi ihe aja ahụ tupu ndị a kpọrọ oku ebido iri ihe.* Gbagoonụ unu ga-ahụ ya nʼoge dịka nke a.” 14Ya mere, ha mere ngwangwa, baa nʼime obodo ahụ. Dịka ha na-abata nʼime obodo, lee Samuel ka ọ na-abịakwute ha; ọ na-aga nʼebe ahụ dị elu. 15Ma nʼụbọchị bọrọ tupu ụbọchị Sọl na-abịa, Onyenwe anyị kpughere nke a nye Samuel. 16“Dịka mgbe a echi, aga m ezitere gị otu nwoke sị nʼala Benjamin. Ị ga-ete ya mmanụ nke ga-eme ya ka ọ bụrụ onyendu Izrel ndị m. Ọ ga-azọpụta ha site nʼaka ndị Filistia, nʼihi na ahụla m ahụhụ nke ha nọ nʼime ya; anụkwala m ịkwa akwa ha.” 17Mgbe Samuel hụrụ Sọl, Onyenwe anyị gwara ya sị, “Lee nwoke ahụ m gwara gị ihe banyere ya! Ọ bụ ya ga-achị ndị m.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.