Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ha na-arịgo ugwu ịbanye obodo ahụ, ha zutere ụfọdụ ụmụ agbọghọ ka ha na-apụta iseta mmiri, jụọ ha ajụjụ sị, “Onye ọhụ ụzọ ahụ ọ nọ nʼebe a?”

1 Samuel 9:11 in English

1 Samuel 9:11 · Berean Standard Bible

And as they were climbing the hill to the city, they met some young women coming out to draw water and asked, “Is the seer here?”

Context

9(Na mgbe gara aga nʼIzrel, ọ bụrụ na mmadụ agaa iju Chineke ase, ọ na-asị, “Bịa ka anyị jekwuru onye ọhụ ụzọ,” nʼihi na onye a na-akpọ onye amụma taa, ka a na-akpọ onye ọhụ ụzọ nʼoge ahụ). 10Sọl sịrị odibo ya, “Ọ dị mma, Bịa ka anyị gaa.” Ha biliri gawa nʼobodo ebe onye Chineke ahụ nọ. 11Mgbe ha na-arịgo ugwu ịbanye obodo ahụ, ha zutere ụfọdụ ụmụ agbọghọ ka ha na-apụta iseta mmiri, jụọ ha ajụjụ sị, “Onye ọhụ ụzọ ahụ ọ nọ nʼebe a?” 12Ụmụ agbọghọ ahụ zara ha sị, “E, ọ nọ ya. Lee ya ka ọ na-aga nʼihu unu. Unu jesie ike unu ga-ahụ ya. Ugbu a ka ọ batara obodo anyị, nʼihi na ọ na-aga iso ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼebe dị elu. 13Ngwangwa unu banye nʼobodo, unu ga-ahụ ya tupu o gaa nʼebe dị elu iri ihe. Nʼihi na ndị mmadụ agaghị ebido iri ihe tutu ruo mgbe o rutere, nʼihi na ọ ghaghị ịgọzi ihe aja ahụ tupu ndị a kpọrọ oku ebido iri ihe.* Gbagoonụ unu ga-ahụ ya nʼoge dịka nke a.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.