Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ha niile zukọrọ nʼebe ahụ, ha kuuru mmiri wụpụ ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị. Nʼụbọchị ahụ kwa, ha buru ọnụ, kwupụta mmehie sị, “Anyị emehiela megide Onyenwe anyị.” Ọ bụ na Mizpa ka Samuel malitere ikpe ụmụ Izrel ikpe.

1 Samuel 7:6 in English

1 Samuel 7:6 · Berean Standard Bible

When they had gathered at Mizpah, they drew water and poured it out before the LORD. On that day they fasted, and there they confessed, “We have sinned against the LORD.” And Samuel judged * the Israelites at Mizpah.

Context

4Ya mere, ndị Izrel wezugara arụsị Baal na Ashtọret ha, bido ife naanị Onyenwe anyị. 5Samuel gwara ha sị, “Unu ndị Izrel, zukọtaanụ na Mizpa, ka m rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ nʼisi unu.” 6Mgbe ha niile zukọrọ nʼebe ahụ, ha kuuru mmiri wụpụ ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị. Nʼụbọchị ahụ kwa, ha buru ọnụ, kwupụta mmehie sị, “Anyị emehiela megide Onyenwe anyị.” Ọ bụ na Mizpa ka Samuel malitere ikpe ụmụ Izrel ikpe. 7Mgbe ndị Filistia nụrụ na ụmụ Izrel zukọrọ na Mizpa, ndị eze ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha, bịa ibuso Izrel agha. Mgbe ụmụ Izrel nụrụ na ha na-abịa nso, ha tụrụ ụjọ nke ukwuu. 8Ha sịrị Samuel, “Akwụsịla itiku Onyenwe anyị Chineke anyị mkpu akwa nʼihi anyị, kpeekwa ekpere ka ọ zọpụta anyị site nʼaka ndị Filistia.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.