1 Samuel 7:2
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Igbe ahụ dịgidere na Kiriat Jearim ogologo oge, iri afọ abụọ zuruoke. Ma nʼoge a niile, ndị Izrel nọ na-eru ụjụ nʼihi Onyenwe anyị.*
1 Samuel 7:2 in English
1 Samuel 7:2 · Berean Standard Bible
And from that day a long time passed, twenty years in all, as the ark remained at Kiriath-jearim. And all the house of Israel mourned and sought after the LORD.
Context
1Ya mere, ndị ikom Kiriat Jearim bịara buru igbe ọgbụgba ndụ* Onyenwe anyị bubata ya nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu. Ha doro Elieza, ọkpara Abinadab nsọ, ka ọ bụrụ onye na-elekọta igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. 2Igbe ahụ dịgidere na Kiriat Jearim ogologo oge, iri afọ abụọ zuruoke. Ma nʼoge a niile, ndị Izrel nọ na-eru ụjụ nʼihi Onyenwe anyị.* 3Ya mere, Samuel gwara ezinaụlọ Izrel niile sị, “Ọ bụrụ na unu ji obi unu niile na alaghachikwute Onyenwe anyị, mgbe ahụ, wezuganụ chi niile nke ndị ala ọzọ, na arụsị Ashtọret site nʼetiti unu. Kpebienụ nʼobi unu ịbịakwute Onyenwe anyị, feekwa naanị ya ofufe. Ọ ga-anapụtakwa unu site nʼaka ndị Filistia.” 4Ya mere, ndị Izrel wezugara arụsị Baal na Ashtọret ha, bido ife naanị Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.