Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ndị Ashdọd hụrụ ihe na-eme, ha sịrị, “Anyị achọghị ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke nke Izrel dịrị nʼetiti anyị, nʼihi na aka ya dị ike nʼahụ anyị, otu aka ahụkwa na chi anyị Dagọn.”

1 Samuel 5:7 in English

1 Samuel 5:7 · Berean Standard Bible

And when the men of Ashdod saw what was happening, they said, “The ark of the God of Israel must not stay here with us, because His hand is heavy upon us and upon our god Dagon.”

Context

5Ọ bụ nke a mere, site mgbe ahụ ruo taa, ndị nchụaja Dagọn na ndị niile na-abata nʼụlọ Dagọn, adịghị azọ ụkwụ ha nʼọnụ ụzọ mbata ụlọ Dagọn dị nʼAshdọd. 6Aka Onyenwe anyị malitere ịdị arọ nʼahụ ndị Ashdọd, ha na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, o ji etuto dị iche iche menye ha egwu ma bibiekwa ha nʼAshdọd nʼoke ala ya niile. 7Mgbe ndị Ashdọd hụrụ ihe na-eme, ha sịrị, “Anyị achọghị ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke nke Izrel dịrị nʼetiti anyị, nʼihi na aka ya dị ike nʼahụ anyị, otu aka ahụkwa na chi anyị Dagọn.” 8Ya mere, ha ziri ozi kpọkọta ndịisi ndị Filistia niile, jụọ ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme igbe chi ndị Izrel?” Ha zara, “Ka e buru igbe chi ndị Izrel buga ya nʼobodo Gat.” Ya mere ha buuru igbe Chineke nke Izrel buga Gat. 9Ma mgbe ha bubatara ya na Gat, aka* Onyenwe anyị malitere imegide obodo ahụ. O tinyere ndị obodo ahụ nʼọnọdụ oke egwu. O tiri ndị bi nʼobodo ahụ ihe otiti, ma nwantakịrị ma dimkpa, etuto dị iche iche toro ha nʼahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.