1 Samuel 4:6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị Filistia nụrụ ụda mkpu a, ha jụrụ sị, “Gịnị na-eme? Ọ bụ gịnị kpatara oke iti mkpu a nʼụlọ ikwu ndị Hibru?” Mgbe a gwara ha na ọ bụ nʼihi na igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị erutela,
1 Samuel 4:6 in English
1 Samuel 4:6 · Berean Standard Bible
On hearing the noise of the shout, the Philistines asked, “What is this loud shouting in the camp of the Hebrews?” And when they realized that the ark of the LORD had entered the camp,
Context
4Ya mere, ha zigara ndị mmadụ ka ha gaa Shaịlo. Ha sitere nʼebe ahụ bute igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye ahụ na-anọkwasị nʼoche ebere nʼetiti cherubim. Ụmụ ndị ikom Elayị abụọ, bụ Hofni na Finehaz, nọnyeere igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ. 5Mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼebe ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha, ndị Izrel tiri mkpu mere ka ala maa jijiji. 6Mgbe ndị Filistia nụrụ ụda mkpu a, ha jụrụ sị, “Gịnị na-eme? Ọ bụ gịnị kpatara oke iti mkpu a nʼụlọ ikwu ndị Hibru?”
Mgbe a gwara ha na ọ bụ nʼihi na igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị erutela, 7ụjọ tụrụ ndị Filistia. Ha sịrị, “Chi abatala nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na ihe dị otu a emetụbeghị nʼoge gara aga. 8*Ahụhụ dịrị anyị! Onye ga-anapụta anyị site nʼaka chi ndị a dị ike? Nʼihi na ọ bụ chi ndị a ji ihe otiti dị iche iche tie ndị Ijipt mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.