1 Samuel 4:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Elayị agbaala iri afọ itoolu na afọ asatọ nʼoge a, nke mere na ọ naghị ahụkwa ụzọ.
1 Samuel 4:15 in English
1 Samuel 4:15 · Berean Standard Bible
Now Eli was ninety-eight years old, and his gaze was fixed because he could not see.
Context
13Mgbe o rutere, Elayị nọ nʼoche ya nʼakụkụ ụzọ, na-eche, nʼihi na obi ya na-ama jijiji, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Mgbe nwoke ahụ batara nʼime obodo, kọọ ihe mere, mkpu akwa dara nʼobodo ahụ niile. 14Elayị nụrụ iti mkpu ahụ jụọ sị, “Gịnị bụ isi ụzụ a?”
Onyeozi ahụ mere ngwangwa bata gwa Elayị okwu. 15Elayị agbaala iri afọ itoolu na afọ asatọ nʼoge a, nke mere na ọ naghị ahụkwa ụzọ. 16Nwoke ahụ gwara Elayị sị, “Esi m nʼihu agha gbalata. Anọ m nʼebe ahụ taa hụ ka agha si gaa.”
Elayị jụrụ sị, “Nwa m, ọ bụ gịnị mere?” 17Onyeozi ahụ zara sị, “Izrel sitere nʼihu ndị Filistia gbaa ọsọ. E tigbukwara ọtụtụ nʼime ndị agha ha. Ọzọ, ụmụ gị abụọ, Hofni na Finehaz nwụrụ. E burukwara igbe ọgbụgba ndụ Chineke.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.