Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha bipụrụ Sọl isi, yipụkwa ya ihe agha ya. Ha zipụkwara ndị ozi gara nʼala ndị Filistia niile ikwusa akụkọ ihe mere nʼụlọ arụsị ha nakwa nʼetiti ndị ha niile.*

1 Samuel 31:9 in English

1 Samuel 31:9 · Berean Standard Bible

They cut off Saul’s head, stripped off his armor, and sent messengers throughout the land of the Philistines to proclaim the news in the temples of their idols and among their people.

Context

7Mgbe ndị Izrel nọ nʼofe ọzọ nke ndagwurugwu, na ndị nọ nʼofe Jọdan, hụrụ na ndị agha Izrel agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha. 8Nʼechi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom atọ ka ha tọgbọ nʼugwu Gilboa. 9Ha bipụrụ Sọl isi, yipụkwa ya ihe agha ya. Ha zipụkwara ndị ozi gara nʼala ndị Filistia niile ikwusa akụkọ ihe mere nʼụlọ arụsị ha nakwa nʼetiti ndị ha niile.* 10Ha tinyere ihe agha Sọl nʼụlọ Ashtọret, kpọgidekwa ozu ya nʼaja ụlọ mgbidi obodo Bet-Shan. 11Mgbe ndị obodo Jebesh Gilead* nụrụ ihe ndị Filistia mere Sọl,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.