1 Samuel 30:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O duuru ha jee nʼebe ndị Amalek nọ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ ha ebe ha tụsara onwe ha nʼala na-eri na-aṅụ, na-etekwa egwu ọṅụ, nʼihi ihe dị ukwuu ha kwatara nʼagha site nʼala ndị Filistia, na nʼala Juda.
1 Samuel 30:16 in English
1 Samuel 30:16 · Berean Standard Bible
So he led David down, and there were the Amalekites spread out over all the land, eating, drinking, and celebrating the great amount of plunder they had taken from the land of the Philistines and the land of Judah.
Context
14Anyị si obodo ebe anyị gara lụọ agha na-alọghachi mgbe ha hapụrụ m nʼebe a. Anyị gara lụgbuo obodo ndị Keret,* nke dị nʼime Negeb, na obodo dị na ndịda ala Juda na ala Kaleb. Anyị gbakwara obodo Ziklag ọkụ.” 15Devid jụrụ ya sị, “I nwere ike duru m gaa ebe ha nọ.”
Nwokorobịa ahụ zara ya sị, “Ọ bụrụ na ị ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke na ị gaghị egbu m maọbụ were m nyeghachi onyenwe m, aga m eduru gị gaa ebe ha nọ.” 16O duuru ha jee nʼebe ndị Amalek nọ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ ha ebe ha tụsara onwe ha nʼala na-eri na-aṅụ, na-etekwa egwu ọṅụ, nʼihi ihe dị ukwuu ha kwatara nʼagha site nʼala ndị Filistia, na nʼala Juda. 17Devid na ndị agha ya bịakwasịrị ha na mberede gbuo ha site nʼabalị ahụ ruo anyasị echi ya. Ọ dịkwaghị otu nwoke nʼime ha fọdụrụ ndụ ma ọ bụghị narị ndị ikom anọ makwasịrị nʼelu ịnyịnya kamel ha gbalaga. 18Devid nwetaghachiri ihe niile ndị Amalek kwatara nʼagha, tinyere ndị inyom ya abụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.