Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị ga-arara gị na ndị Izrel nyefee nʼaka ndị Filistia, echi gị na ụmụ gị ndị ikom ga-abịa nọnyeere m nʼebe a. Onyenwe anyị ga-ararakwa ndị agha Izrel nye nʼaka ndị Filistia.”

1 Samuel 28:19 in English

1 Samuel 28:19 · Berean Standard Bible

Moreover, the LORD will deliver Israel with you into the hand of the Philistines, and tomorrow you and your sons will be with me. And the LORD will deliver the army of Israel into the hand of the Philistines.”

Context

17Onyenwe anyị emeela ihe ọ sị na ọ ga-eme. Ọ napụla gị alaeze gị were ya nye Devid.* 18Ihe ndị a niile na-aga ịdakwasị gị nʼihi na i geghị ntị na ndụmọdụ Onyenwe anyị, mgbe o were iwe dị ọkụ megide ndị Amalek. 19Onyenwe anyị ga-arara gị na ndị Izrel nyefee nʼaka ndị Filistia, echi gị na ụmụ gị ndị ikom ga-abịa nọnyeere m nʼebe a. Onyenwe anyị ga-ararakwa ndị agha Izrel nye nʼaka ndị Filistia.” 20Ngwangwa, Sọl dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼoke egwu, nʼihi okwu ndị a niile Samuel kwuru. Ike adịghịkwa nʼime ya nʼihi agụụ, ebe ọ bụ na o ribeghị nri ọbụla ụbọchị ahụ niile. 21Mgbe nwanyị a hụrụ ọnọdụ Sọl, ọ gwara ya okwu sị ya, “Onyenwe m, lee, ohu gị rubere isi mee ihe ị sị m mee. Ọ bụkwa ndụ m ka m ji chụọ aja imezu ihe ị rịọrọ m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.